49
Ozi e ziri banyere Amọn
Nke a dịrị ndị Amọn:
 
Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru,
“Ọ bụ na Izrel enweghị ụmụ ndị ikom?
Izrel o nweghị onye nnweta ihe o nwere?
Gịnị mere Molek ji nweta obodo Gad?
Gịnị mere ndị ya ji bichie obodo ya niile?
Ma ụbọchị ahụ na-abịa,” ka Onyenwe anyị kwupụtara,
“mgbe m ga-eme ka a nụ ụda iti mkpu agha,
nke a ga-eti megide Raba, obodo ndị Amọn.
A ga-eme ya ka ọ ghọọ mkputamkpu ebe.
A ga-esurekwa ya ọkụ, ya na obodo nta niile gbara ya gburugburu.
Mgbe ahụ Izrel ga-achụpụkwa
ndị ahụ niile chụpụrụ ya.”
Otu a ka Onyenwe anyị kwuru.
“Kpọọ mkpu akwa, gị Heshbọn, nʼihi na ebibiela Ai!
Tisienụ mkpu akwa ike unu ndị bi na Raba!
Yirinụ uwe mkpe unu, tiekwanụ aka nʼobi nʼihi iru ụjụ;
gbagharịanụ nʼogige mgbidi obodo unu,
nʼihi na a ga-adọta Molek nʼagha,
buru ya na ndị nchụaja ya na ndịisi ọchịchị ya gaa mba ọzọ.
Gịnị mere unu ji anya isi nʼihi ndagwurugwu
nke na-amị mkpụrụ hiri nne,
gị ada nwanyị na-ekwesighị ntụkwasị obi,
onye ntụkwasị obi ya dị nʼakụnụba ya,
gị onye na-asị, ‘Onye ga-ebuso m agha?’
Aga m esite nʼaka ndị niile gbara gị gburugburu
mee ka oke egwu bịakwasị gị,”
otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwupụtara ya,
“A ga-achụpụ onye ọbụla nʼime unu.
Ọ dịkwaghị onye ga-achịkọta ndị ahụ niile gbapụrụ agbapụ.
 
“Ma mgbe e mesịrị, aga m emekwa ka ndị Amọn laghachikwa nʼala ha.”
Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.
Ozi e ziri banyere Edọm
Nke dịrị Edọm:
 
Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru,
“Ọ pụtara na onye amamihe adịghịkwa na Teman?
Okwu ndụmọdụ ọ gwụla nʼọnụ ndị nwere nghọta?
Amamihe ha o reela ure?
Chigharịanụ gbalaga, unu ndị bi na Dedan.
Gaa zoonụ onwe unu nʼọgba nkume miri emi,
nʼihi na aga m eme ka ihe ọjọọ bịakwasị Ịsọ,
nʼoge ahụ m ga-ata ya ahụhụ.
Ọ bụrụ na ndị na-aghọrọ mkpụrụ vaịnị abịakwute gị,
ọ bụ na ha agaghị ahapụrụ gị mkpụrụ ole na ole?
Ọ bụrụkwa na ndị ohi abịa nʼabalị,
ọ bụghị naanị ihe ha chọrọ ka ha ga-akwakọrọ?
10 Ma aga m agba Ịsọ ọtọ.* 49:10 Agaghị ahapụrụ ya ihe ọbụla
Aga m ekpughe ebe nzuzo ya niile
ka ọ ghara izobe onwe ya.
Ụmụ ya na ndị ikwu ya, 49:10 Maọbụ, ndị ikom ya ji ngwa agha
tinyere ndị ya na ha dị na mma na ndị agbataobi ya, ga-ala nʼiyi.
Ya mere, ọ dịghịkwa onye ga-asị,
11 ‘Hapụnụ ụmụ mgbei unu niile, nʼihi na mụ onwe m ga-edebe ha ndụ.
Ndị inyom unu niile ndị di ha nwụrụ nwere ike ịtụkwasị m obi.’ ”
12 Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, “Ọ bụrụ na e mere ka ndị ahụ na-ekwesighị ịṅụ ihe dị nʼiko ahụ ṅụọ ya, a ga-esi aṅaa ghara ịta gị ahụhụ? A ghaghị ịta gị ahụhụ; ị ghakwaghị ịṅụ site nʼiko ahụ.” 13 “Eji m onwe m ṅụọ iyi, otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara, sị, na Bozra ga-aghọ mkpọmkpọ ebe, na ihe iju anya, na ihe ịta ụta, na ihe ịbụ ọnụ. Obodo ya niile ga-aghọkwa mkpọmkpọ ebe ruo mgbe ebighị ebi.”
14 Anụla m ozi si nʼọnụ Onyenwe anyị.
E zipụla onyeozi ka ọ ga mba niile dị iche iche zie ha ozi, sị,
“Chịkọtaanụ onwe, megide ya.
Bilikwanụ maka ibu agha!”
 
15 Ugbu a, aga m eme ka ị dị nta nʼetiti mba dị iche iche,
ihe nlelị na-ebe mmadụ nọ.
16 Ịdị egwu gị nke na-eyinye ndị mmadụ egwu,
na nganga nke obi gị eduhiela gị,
gị onye na-ebi na mgbawa niile nke nkume dị elu,
gị onye ji ebe niile dị elu nke ugwu nʼaka ya.
A sịkwarị na i wuo akwụ gị nʼebe dị elu, dịka ebe ugo ga-ewu akwụ ya,
aga m esite nʼebe ahụ kpụdata gị nʼala,
otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.
17 “Edọm ga-aghọ ihe iju anya.
Ndị niile na-esi nʼakụkụ ya agafe ga-anọ nʼọnọdụ iju anya,
ha ga-eledakwa ya anya nʼihi ọnya ya niile.
18 Dịka a kwaturu Sọdọm na Gọmọra,
ya na obodo niile gbara ya gburugburu.
Otu a kwa, ọ dịghị onye ọbụla ga-ebi nʼebe ahụ;
nwa mmadụ ọbụla agakwaghị ebi nʼime ya,” otu a ka Onyenwe anyị kwuru.
 
19 “Aga m esi nʼala ya chụpụ Edọm nʼotu ntabi anya,
dịka mgbe ọdụm na-esi nʼoke ọhịa Jọdan
na-arịgopụta nʼebe ịta nri nke ụmụ anụmanụ jupụtara nʼahịhịa ndụ.
Ma onye bụ onye ahụ a họpụtara, onye m ga-enyefe ọrụ a nʼaka ya?
Onye dịka m? Onye kwa pụrụ ịpụta tụọ m aka nʼihu?
Onye bụkwa onye ọzụzụ atụrụ ahụ nke pụrụ ido onwe ya megide m?”
 
20 Nʼihi nke a, nụrụ ihe Onyenwe anyị kwadobere megide Edọm,
nụrụkwa ihe o zubere megide ndị bi na Teman.
A ga-adọkpụrụ ndị dị nta nʼetiti igwe ewu na atụrụ ahụ,
ebe ịta nri ha ga-anọ nʼọnọdụ mgbagwoju anya nʼihi nke a.
21 Ụwa ga-ama jijiji mgbe ha nụrụ mkpọtụ ọdịda ha;
iti mkpu akwa ha ga-adakwa ụda ruo nʼOsimiri Uhie.
22 Lee, otu ugo ga-efeli elu, fedatakwa.
Ọ ga-agbasapụ nku ya kpuchie ala Bozra niile.
Nʼụbọchị ahụ, obi ndị bu dike nʼagha nʼEdọm
ga-adị ka obi nwanyị ime na-eme.
Ozi e ziri banyere Damaskọs
23 Nke dịrị Damaskọs:
“Ụjọ ejula Hamat na Apad obi,
nʼihi na ha anụla akụkọ ọjọọ.
Ha adaala mba,
nọọkwa nʼoke echiche dịka osimiri nke ebili na-amagharị nʼelu ya.
24 Damaskọs aghọọla onye ike gwụrụ.
Ọ tụgharịala ịgbapụ ọsọ,
ma ọma jijiji ejidela ya.
Oke obi ụfụ na ihe mgbu ejidesiela ya aka ike,
dịka obi ụfụ na ihe mgbu nke na-ejide nwanyị ime na-eme.
25 Gịnị mere na-agbahapụbeghị obodo ahụ a maara aha ya,
bụ obodo ahụ nke ihe ya na-atọ obi m ụtọ?
26 Nʼezie, ụmụ okorobịa nọ nʼime ya ga-ada nʼokporoụzọ niile,
a ga-emekwa ka ndị agha ya niile dere duu nʼụbọchị ahụ.”
Otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwubiri.
27 “Aga m esunye mgbidi Damaskọs ọkụ.
Ọkụ ahụ ga-eripịakwa ebe e wusiri ike nke Ben-Hadad.”
Ozi e ziri banyere Keda na Hazọ
28 Banyere Keda na alaeze Hazọ, nke Nebukadneza eze Babilọn busoro agha:
 
Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru,
“Bilienụ gaa buso Keda agha.
Bibiekwanụ ndị ahụ niile bi nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ.
29 A ga-adọta ụlọ ikwu ha, na igwe ewu na atụrụ ha nʼagha.
A ga-ebukọrọkwa ụlọ mgbochi ha niile,
ya na ngwongwo na ịnyịnya kamel ha niile.
Ndị mmadụ ga-etikwa mkpu sị ha,
‘Oke egwu dị nʼakụkụ niile!’
 
30 “Gbalaganụ ọsịịsọ.
Jeenụ nọdụ nʼime ọgba nkume niile miri emi, unu ndị niile bi na Hazọ,”
otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.
Nebukadneza eze Babilọn atụọla atụmatụ megide unu,
o chepụtakwala ụzọ ọ ga-esi megide unu.
 
31 “Bilienụ, gaa buso mba ahụ agha,
bụ mba ahụ na-ebi na ntụkwasị obi,”
otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara,
“mba nke na-enweghị ibo ọnụ ụzọ, maọbụ mkpọrọ e ji akpọchi ya,
mba ahụ nke ndị ya na-ebiri naanị onwe ha.
32 Ịnyịnya kamel ha ga-abụ ihe a ga-akwata nʼagha,
ọtụtụ igwe ehi ha ga-abụkwa ihe a ga-alụta nʼagha.
Aga m efesa ha nye ifufe, bụ ndị niile nọ ebe dị anya, bụ ndị ahụ niile na-akpụchapụ agịrị isi egedege ihu ha.
Aga m emekwa ka ihe ọjọọ si nʼakụkụ niile bịakwasị ha,”
otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.
33 “Mgbe ahụ, Hazọ ga-aghọ ebe obibi nke nkịta ọhịa.
Ọ ga-aghọ ebe tọgbọrọ nʼefu ruo mgbe ebighị ebi.
O nweghị onye ọbụla ga-ebi nʼebe ahụ,
nwa mmadụ ọbụla agakwaghị ebi nʼime ya.”
Ozi banyere Ilam
34 Nke a bụ okwu Onyenwe anyị ndị ruru Jeremaya onye amụma ntị banyere Elam, mgbe Zedekaya eze Juda bidoro ọchịchị ya.
 
35 Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru,
“Lee, aga m agbaji ụta nke Elam,
bụ ụta ahụ ha ji anya isi na ọ bụ ebe ike ha dị.
36 Aga m esite nʼakụkụ anọ nke mbara eluigwe zite oke ifufe anọ,
nke ga-abịa megide Elam.
Aga m efesa ha nye oke ifufe anọ ndị a,
ndị ga-ebufu ha buga ha na mba niile dị iche iche,
ọ dịghị obodo a na-agaghị ahụ ndị Ilam a dọtara nʼagha.
37 Aga m etipịa Elam nʼihu ndị iro ha,
e, nʼihu ndị ahụ na-achọsi ndụ ya ike.
Aga m eme ka ihe ọjọọ bịakwasị ha,
meekwa ka oke iwe m dị ọkụ bịakwasị ha,”
otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.
“Aga m eji mma agha chụọ ha ọsọ
tutu ruo mgbe m mere ka ha niile gwụsịa.
38 Aga m edo ocheeze m nʼElam,
bibiekwa eze ya na ndịisi ọchịchị ya,”
otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.
 
39 “Ma nʼikpeazụ, nʼụbọchị ndị ahụ na-abịa,
aga m eweghachite akụnụba niile nke Elam.”
Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.

*49:10 49:10 Agaghị ahapụrụ ya ihe ọbụla

49:10 49:10 Maọbụ, ndị ikom ya ji ngwa agha