Abụ Ọma 82
Abụ Ọma Asaf.
Chineke onye ikpe kachasị ndị ikpe
1 Chineke na-ewere ọnọdụ ịchị isi nʼetiti ọgbakọ dị ukwuu;
ọ na-ekpebi ikpe nʼetiti chi niile.
2 Ruo ole mgbe ka unu ga-anọgide na-ekpe ikpe na-ezighị ezi?
Ruo ole mgbe ka unu ga na-egosi ndị ajọ omume ihuọma?
Sela
3 Kperenụ ndị na-adịghị ike na ndị na-enweghị nna ikpe ziri ezi;
hụnụ na ndị ogbenye na ndị a na-emegbu nwetara ihe ruuru ha.
4 Gbapụtanụ ndị na-adịghị ike na ndị nọ na mkpa;
napụta ha site nʼaka ndị ajọ omume.
5 Ha* 82:5 Maọbụ, chi ndị a amaghị ihe ọbụla, ha aghọtaghị ihe ọbụla.
Ha na-ejegharị nʼọchịchịrị;
ntọala niile nke ụwa na-ama jijiji.
6 “Asịrị m, ‘Unu bụ “chi,”
unu niile bụ ụmụ ndị ikom nke Onye kachasị ihe niile elu.’
7 Ma unu ga-anwụ ọnwụ dịka mmadụ ndị ọzọ;
unu ga-ada dịka ndị ọchịchị ọzọ.”
8 O Chineke, bilie kpee ụwa ikpe,
nʼihi na mba niile bụ ihe nketa gị.