28
Nwa mgbe nta: Ebe a na-achọta amamihe
1 Olulu e si egwupụta ọlaọcha dị;
ebe a na-anụcha ọlaedo dịkwa.
2 E si nʼime ala ewepụta igwe,
ọlanchara na-agbazepụta site nkume na-aghọ ọla.
3 Mmadụ na-eme ka ọchịchịrị nwee ọgwụgwụ;
ọ na-enyochapụta ihe dị ebe dị anya,
na-achọ igwe nʼime oke ọchịchịrị.
4 Ọ na-egwu olulu nʼebe dị anya site nʼebe mmadụ bi,
nʼebe ụkwụ mmadụ na-adịghị eru,
nʼebe ahụ dị anya site nʼebe mmadụ bi ka ha na-akwụfegharị.* 28:4 Nʼoge ochie, ọ bụ nʼoche e ji eriri kegide ka ndị na-egwupụta ihe dị iche iche site nʼime ala na-anọdụ ala. Mgbe a na-adọtu ha, ụkwụ ha adịghị eru ala, ha na-akwụfegharịkwa nʼihi ọnọdụ ha.
5 Ala ahụ e si na ya enweta nri,
abụrụla ihe e ji ọkụ gbanwee nʼokpuru ya.
6 Safaia bụ nkume dị oke ọnụahịa dị na nkume ya;
aja ya nwekwara mkpụrụ ọlaedo.
7 Ọ dịghị anụ ufe nke na-eri anụ maara ụzọ ahụ zoro ezo;
anya agụ nkwọ ọbụla ahụtụbeghị ya.
8 Anụ ọhịa dị nganga anaghị azọnye ụkwụ nʼelu ya,
ọdụm ọbụla adịghị awagharị nʼebe ahụ.
9 Ndị mmadụ na-eji aka na-etiwasị nkume ahụ na-enwu ọkụ
mee ka mgbọrọgwụ ugwu ahụ pụta ìhè.
10 Ha na-awapụta ọwa ụzọ nʼetiti nkume ahụ,
anya ha na-ahụkwa akụnụba ya niile.
11 Ha na-achọpụta isi mmiri niile
ma meekwa ka ihe nzuzo pụta ìhè.
12 Ma olee ebe ka a ga-achọta amamihe?
Olee kwa ebe nghọta bi?
13 Mmadụ apụghị ịghọta ọnụahịa ya,
agaghị achọtakwa ya nʼala ndị dị ndụ.
14 Ogbu mmiri na-asị, “Ọ dịghị nʼime m,”
osimiri na-asị, “Ọ dịghị nʼaka m.”
15 A gaghị eji ọlaedo a nụchara nke ọma zụta ya,
apụghị ịtụ ihe bụ ọnụahịa ya nʼọlaọcha.
16 A gaghị eji ọlaedo nke Ọfịa zụta ya,
a gaghị ejikwa nkume dara oke ọnụahịa nke ọniks maọbụ safaia zụta ya,
17 A gaghị eji ọlaedo maọbụ kristal tụnyere ya,
maọbụ iji ejiji ọlaedo nweta ya.
18 Koral na jaspa erughị ihe a na-akpọtụ aha nʼebe ọ dị;
ọnụahịa nke amamihe karịrị ọtụtụ rubi.
19 A gaghị eji ọla topaazi nke Kush tụnyere ya;
a pụghị iji ọlaedo a nụchara anụcha zụta ya.
20 Olee ebe amamihe si abịa?
Olee ebe nghọta bi?
21 E zoro ya ezo site nʼanya ihe niile dị ndụ,
e kpuchikwara ya nye ọ bụladị anụ ufe nke eluigwe.
22 Mbibi na ọnwụ na-asị;
“Naanị akụkọ ya ruru anyị ntị.”
23 Chineke ghọtara ụzọ ya,
naanị ya makwara ebe obibi ya dị.
24 Nʼihi na ọ na-ahụ nsọtụ nke ụwa,
na-ahụkwa ihe niile dị nʼokpuru eluigwe.
25 Mgbe o hiwere ike nke ikuku,
tụọkwa mmiri nʼihe ọtụtụ,
26 mgbe o nyere mmiri ozuzo iwu
meekwa ụzọ nye egbe eluigwe na oke ikuku,
27 mgbe ahụ, o lere amamihe anya, nyochasịa ya,
meekwa ka o guzosie ike, ma nwapụtakwa ya.
28 Ọ sịrị mmadụ,
“Ịtụ egwu Onyenwe anyị, nke ahụ bụ amamihe;
ọzọ, ị sị nʼihe ọjọọ wezuga onwe bụ nghọta.”
*28:4 28:4 Nʼoge ochie, ọ bụ nʼoche e ji eriri kegide ka ndị na-egwupụta ihe dị iche iche site nʼime ala na-anọdụ ala. Mgbe a na-adọtu ha, ụkwụ ha adịghị eru ala, ha na-akwụfegharịkwa nʼihi ọnọdụ ha.