Job. 20. Mgbe ahụ, Zofa onye Neama zara sị: “Enweghị udo nke echiche m na-akpali m izaghachi nʼihi na anọ m na mwute dị ukwuu. Anụla m okwu mkparị nke ileda anya nye m, ma nghọta m na-akpalịte m ịzaghachi gị. “Nʼezie, ị maara otu ọ dị site na mgbe ochie, ya bụ kemgbe e debere mmadụ nʼụwa. Obi ụtọ nke onye na-emebi iwu na-adị nwa mgbe nta, ọṅụ nke ndị na-amaghị Chineke na-anọ naanị nwa oge. Nʼagbanyeghị na ịnya isi ya ga-eru eluigwe, na isi ya ga-emetụkwa igwe ojii; ọ ga-ala nʼiyi ebighị ebi, dịka nsị ya onwe ya nyụrụ; ndị maara ya ga-ajụ, ‘Olee ebe ọ nọ?’ Ọ ga-efelaga dịka nrọ, agaghị achọtakwa ya mgbe ọbụla, dịka ọhụ abalị nke e chefuru echefu. Anya hụrụ ya na mbụ agaghị ahụkwa ya ọzọ, ebe obibi ya agaghị elegidekwa ya anya ọzọ. Ụmụ ya ga-achọ ihuọma site nʼaka ndị ogbenye; aka ya abụọ kwa ga-enyeghachi akụ ya. Ọkpụkpụ ya nke jupụtara nʼike okorobịa ga-eso ya bụrụ ihe a ghanyere na ntụ. “Ọ bụ ezie na ihe ọjọọ na-atọ ya ụtọ nʼọnụ, na ọ na-ezokwa ya nʼokpuru ire ya; ọ bụ ezie na ọ pụghị nʼịhapụ ya, ọ na-edebe ya nʼọnụ ya, ma nri ọ na-eri ga-aghọ ihe gbara ụka nʼafọ ya, ọ ga-aghọkwa elo agwọ nʼime afọ ya. Ọ ga-agbọpụta akụnụba niile o lodara; Chineke ga-eme ka o si nʼafọ ya gbọpụtachaa ha. Ọ ga-amịcha elo agwọ, eze agwọ ajụala ga-egbu ya. Ọ gaghị anụ ụtọ mmiri si nʼiyi, bụ iyi nke na-asọ asọ nke jupụtara na mmanụ aṅụ na mmiri ara ehi rahụrụ arahụ. Ihe ọ rụpụtara ka ọ ga-eji kwụghachi ụgwọ o ji na-erighị ma otu. Uru ọ zụtara nʼahịa agaghị abụrụ ya ihe ọṅụ. Nʼihi na ọ kpagburu ndị ogbenye, hapụ ha na-enweghị olileanya ọbụla, ọ nakọtakwara ụlọ nke ọ na-ewughị. “Nʼezie, ọ gaghị enwe izuike site nʼoke ọchịchọ ya; ọ gaghị azọpụtakwa onwe ya site nʼụlọakụ ya. Ọ dịghị ihe fọdụụrụ ya iripịa, ọganihu ya agaghị adịgide. Nʼetiti ihe niile o nwere ka mkpagbu ga-abịakwasị ya, oke ịta ahụhụ ga-adakwasị ya. Mgbe o rijuru afọ ka Chineke ga-eme ka iwe ya dị ọkụ megide ya, iti aka Chineke ga-adakwasị ya dịka mmiri ozuzo. Ọ bụrụ na o si na ngwa agha e ji igwe kpụọ gbalaga, àkụ nke e ji ọla bronz kpụọ ọnụ ya ga-amapu ya ahụ. Nʼazụ ya ka ọ na-esi mịpụta ya, site nʼumeju ya ka a ga-esi mịpụta ọnụ ya na-egbu amụma. Oke egwu dị iche iche ga-abịakwasị ya. Oke ọchịchịrị nọ na-echere akụnụba ya, ọkụ nke a na-afụnwughị afụnwu ga-erepịa ya ọ ga-erechapụkwa ihe niile fọdụrụ nʼụlọ ikwu ya. Eluigwe ga-ekpughe ikpe ọmụma ya ụwa niile ga-ebili megide ya. Idee mmiri ga-ebupu ụlọ ya; oke mmiri okwukwo nʼụbọchị iwe Chineke. Nke a bụ oke nke Chineke debeere ndị na-emebi iwu, ya bụkwa ihe nketa nke Chineke kwadooro ha.”