Abụ Ọma. 110. Abụ Ọma Devid. Onyenwe anyị gwara Onyenwe m okwu sị ya: “Nọdụ ala nʼaka nri m ruo mgbe m ga-eme ndị iro gị ihe mgbakwasị ụkwụ nye ụkwụ gị.” Onyenwe anyị ga-eme ka ike ọchịchị gị site na Zayọn ruo ala ndị ọzọ; ị ga-achị nʼetiti ndị iro gị niile. Nʼụbọchị ị ga-ebu agha, ndị agha gị niile ga-ahọrọ nʼonwe ha i soro gị. Ndị yikwasịrị ịma mma nke ịdị nsọ ka uwe, bụ ụmụ okorobịa gị ga-abịakwute gị dịka igirigi site nʼafọ ụtụtụ. Onyenwe anyị aṅụọla iyi, ọ gaghị agbanwe uche ya: “Gị onwe gị bụ onye nchụaja ruo mgbe ebighị ebi, nʼusoro Melkizedek.” Onyenwe anyị nọ nʼaka nri gị. Ọ ga-egwepịa ndị eze nʼụbọchị oke iwe ya. Ọ ga-ekpe mba niile ikpe, na-atụkọta ndị nwụrụ anwụ, ma gwepịa ndị na-achị achị nʼelu ụwa niile. Ọ ga-aṅụ mmiri site nʼiyi nta nke dị nʼakụkụ ụzọ; nʼihi nke a, ọ ga-eweli isi ya elu.