Abụ Ọma. 120. Abụ nrigo. Ana m akpọku Onyenwe anyị nʼime nsogbu m, ọ na-azakwa m. O Onyenwe anyị, zọpụta m site nʼegbugbere ọnụ okwu ụgha na ire na-ekwu okwu aghụghọ. Gịnị ka a ga-eme gị, ọ bụkwa gịnị ọzọ ka a gatụkwasịri gị, gị ire aghụghọ? Ọ ga-eji àkụ dị nkọ nke dike nʼagha taa gị ahụhụ, ya na icheku ọkụ osisi brum na-ere ere. Ahụhụ dịịrị m nʼihi na m bi na Meshek, nʼihi na m bikwa nʼetiti ụlọ ikwu ndị Keda! Ogologo oge ka m binyere ndị kpọrọ udo asị. Abụ m onye udo; ma mgbe m kwuru okwu, okwu ha bụ okwu agha.