Abụ Ọma. 129. Abụ nrigo. Site na mgbe m bụ nwantakịrị, ha kpagburu m ọtụtụ oge, ka Izrel kwuo. “Site na mgbe m bụ nwantakịrị, ha kpagburu m ọtụtụ oge, ma ha enweghị ike merie m. Ndị ikom na-akọ ubi akọgharịala azụ m dịka ala ubi, mee ebe ha kọrọ akọ ka ọ dị ogologo. Ma Onyenwe anyị bụ onye ezi omume; ọ tọpụla m site nʼagbụ niile nke ndị ajọ omume.” Ka ndị niile kpọrọ Zayọn asị bụrụ ndị ga-alaghachi azụ nʼihere. Ka ha niile dịrị ka ahịhịa na-epu nʼelu ụlọ nke na-akpọnwụ tupu o pupụta; nke onye na-ewe ihe ubi na-adịghị eji ha kpojuo aka ya abụọ, maọbụ onye mkpokọta e nwee ike kpojuo aka ya. Ka ndị si nʼụzọ na-agafe hapụ ị sị ha, “Ngọzị Onyenwe anyị dịrị unu. Anyị na-agọzi unu nʼaha Onyenwe anyị.”