Abụ Ọma. 140. Abụ nke dịrị onyeisi abụ. Abụ Ọma Devid. O Onyenwe anyị, dọpụta m site nʼaka ndị na-eme ihe ọjọọ. Chebe m ka m ghara ịdaba nʼaka ndị na-eme ihe ike dị iche iche. Ndị na-atụ atụmatụ ime ihe ọjọọ nʼobi ha na-akpali agha ụbọchị niile. Ha na-eme ire ha ka ha dị nkọ dịka nke agwọ; elo ajụala dị nʼegbugbere ọnụ ha. Sela Chebe m Onyenwe anyị, ka m ghara ịdaba nʼaka ndị na-emebi iwu; chebe m ka m ghara ịdaba nʼaka ndị na-eme ihe ike, ndị na-eche echiche ọdịda m. Ndị mpako esielera m ọnya igbudu; ha agbasaala ụgbụ ha na udo ha, siekwara m ọnya dị iche iche nʼụzọ m na-aga. Sela A sịrị m Onyenwe anyị, “Gị onwe gị bụ Chineke m.” Nụrụ, O Onyenwe anyị, olu arịrịọ m maka amara. Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị Onye nzọpụta m dị ike, ị na-ekpuchi isi m nʼụbọchị agha. Ekwekwala ka ndị ajọ omume chọta ihe ha na-achọ, o Onyenwe anyị, ekwekwala ka nzube ha mezuo. Sela Ndị niile gbara m gburugburu na-ebuli isi ha elu na nganga ka ndụ ọjọọ nke egbugbere ọnụ ha rikpuo ha. Ka icheku ọkụ na-ere ere dakwasị ha; ka a tụba ha nʼime ọkụ na-ere ere, nʼime olulu apịtị jupụtara, nke ha na-enweghị ike isite nʼime ya pụta ọzọ. Ekwela ka ndị na-ekwu okwu nkwulu guzosie ike nʼala, ka ihe ọjọọ chụda ndị na-eme ihe ike. Amaara m na Onyenwe anyị ga-ekpe ikpe ziri ezi nye ndị ogbenye na-emekwa ka ndị nọ na mkpa nweta ihe ruuru ha. Nʼezie, ndị ezi omume ga-eto aha gị, ndị ziri ezi ga-ebikwa nʼihu gị.