Ilu. 7. Na-agbaso okwu m nwa m, nọgide na ya, dokwaa iwu m niile nʼime obi gị. Debe iwu m ka ị dị ndụ, chee ozizi m nche dịka ọ bụ mkpụrụ anya gị. Kee ha na mkpịsịaka gị, deekwa ha nʼelu mbadamba nkume, bụ obi gị. Hụ amamihe nʼanya dịka nwaagbọghọ ị hụrụ nʼanya; hụkwa inwe nghọta nʼanya dịka a ga-asị na ọ bụ nwanne gị. Kwee ka ha debe gị, ka ị ghara ijekwuru nwanyị na-akwa iko, ka ị gharakwa ịṅa ntị nʼokwu ire ụtọ ya. Nʼihi na otu ụbọchị, esi m na oghereikuku dị nʼụlọ m lepụ anya, hụ nʼetiti ndị na-enweghị uche, ahụtara m otu nwokorobịa nʼetiti ha, onye amamihe kọrọ, ka ọ na-aga nʼụzọ dị nso ebe nkuku ụlọ nʼakụkụ ụlọ nwanyị ihere na-adịghị eme, nʼoge anyasị, dịka chi na-eji, mgbe ọchịchịrị na-agbachi. Mgbe ahụ, nwanyị ahụ pụtara zute ya. O yi uwe dịka nwanyị akwụna, jiri aghụghọ na-abịakwute ya. (Ọ na-eme ụzụ na-aṅaghị ntị ịnụ ihe ọbụla. Ụkwụ ya anaghị anọgide nʼụlọ ya. Ọ na-akwụgharị ma nʼokporoụzọ ma nʼama; na-amịgharị nʼebe nzuzo niile.) O weere aka ya abụọ jikụọ nwokorobịa ahụ nʼolu, sutu ya ọnụ, were ihu nke ihere na-adịghị, sị: “Emezuru m nkwa niile m kwere taa, enwekwara m nri nke sitere nʼihe aja udo m chụrụ nʼụlọ m, Ọ bụ gị ka m na-achọkwute, lee gị ka ị na-abịa. Agbasaala m akwa mara mma nʼelu ihe ndina m, bụ akwa ọcha mara mma tụrụ ọtụtụ agwa nke e ji ogho ndị Ijipt kpaa. Efesakwala m mmanụ isi ọma nke máá, aloos na sinamọn nʼelu nʼihe ndina m. Bịa, ka anyị were ịhụnanya ṅụjụbiga afọ anyị; ka anyị mee onwe anyị obi ụtọ site ugbu a ruo ụtụtụ echi. Nʼihi na di m anọghị nʼụlọ o jeela njem dị anya. O ji akpa ego juru gaa njem, abalị ole na ole ga-agafekwa tupu ọ lọta.” Otu a ka o si jiri okwu ire ụtọ ya megharịa nwokorobịa ahụ isi tutu o kwenyere ya. O nwekwaghị ike ịnapụta onwe ya site nʼokwu nrafu nke nwanyị ahụ. O sooro nwanyị ahụ dịka ehi a na-adọkpụ na-aga ebe a ga-egbu ya, dịka ele nke na-aba nʼọnya, nke na-eche ka e were àkụ gbata ya nʼobi. Nwoke ahụ dịka nnụnụ nke na-efeba nʼọnya na-amaghị ihe na-eche ya pụrụ iwepụ ndu ya. Geenụ ntị, ụmụ m, ma ọ bụghị naanị ige ntị, kama meekwanụ ihe m na-ekwu. Ekwela ka agụụ nke obi gị chịa gị; ejela nwanyị dị otu a nso; gbaara ya ọsọ, ka ọ ghara ịnwa gị nwetakwa gị. Nʼihi na o mebiela ndụ ọtụtụ mmadụ, ọtụtụ mmadụ amaala nʼọnya ya. Ụlọ ya bụ okporoụzọ nke na-eduba nʼili, nke na-edubakwa nʼala ọnwụ.