Ilu. 13. Nwa maara ihe na-ege ntị na ndụmọdụ nna ya ma onye na-akwa emo adịghị ege ntị nʼịba mba. Onye na-eme ezi ihe ga-esite nʼokwu ọnụ ya nweta ụgwọ ọrụ, ma ndị na-aghọgbu ibe ha ga-anata ihe ike dịka ụgwọ ọrụ ha. Mmadụ zuruoke bụ onye na-ejide ire ya aka! Ma onye ekwuruekwu na-ewetara onwe ya mbibi. Ndị umengwụ na-achọ ọtụtụ ihe ma ọ dịghị ihe ha na-enweta; ma onye na-arụsị ọrụ ike na-enweta ihe niile ọ chọrọ. Onye ezi omume kpọrọ ụgha asị, ma okwu ọnụ onye na-emebi iwu na-ewetara ya ihere na nkọcha. Ezi omume mmadụ na-abara ya uru na ndụ ya niile, ma ajọ omume ndị mmehie na-ala ha nʼiyi. Ọ dị mmadụ na-eme ka ọ bụ ọgaranya maọbụ onye ụkpa. Ma ọ dịkwa mmadụ na-eme ka ọ bụ onye ụkpa maọbụ ọgaranya. Ọgaranya nwere ike jiri ego ya gbapụta onwe ya, ma ogbenye adịghị azaghachi mba banyere imerụ ya ahụ. Ìhè onye ezi omume na-enwupụ enwupụ, ma oriọna onye mmebi iwu ga-anyụ. Nganga na-eweta esemokwu, ma a na-ahụ amamihe nʼime ndụ ndị na-anata ndụmọdụ. Akụ a kpatara ngwangwa na-emebikwa ngwangwa; ma akụ sitere nʼịrụsị ọrụ ike na-eto eto. Nchere a na-echere ogologo oge maka imezu olileanya e nwere na-egbu obi, mgbe ihe a na-eche mezuru, oke ọṅụ na-adị. Onye na-elelị ntụziaka anya ga-akwụ ụgwọ nʼihi ya, ma onye na-atụ egwu ihe enyere nʼiwu ga-anata ụgwọ ọrụ ya. Nkuzi nke onye maara ihe bụ isi iyi nke ndụ, nke na-eme ka mmadụ ghara ịma nʼọnya ọnwụ. Ezi nghọta na-eweta ihuọma, ma ụzọ nke ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi na-eduba ha na mbibi. Onye nwere uche na-eji ọmụma ihe nʼarụ ọrụ, ma ndị nzuzu na-egosipụta enweghị uche ya. Onyeozi ajọ omume na-adaba na nsogbu, ma onyeozi kwesiri ntụkwasị obi na-eweta ọgwụgwọ. Onye na-ajụ ịdọ aka na ntị ga-anwụ nʼụkpa na nʼihere; ma onye na-anabata ịdọ aka na ntị ka a ga-asọpụrụ. Mgbe ihe a na-ele anya mezuru ọ na-atọ mkpụrụobi ụtọ, ma ndị nzuzu kpọrọ isite nʼajọ ihe wezuga onwe ha asị. Na-eso ndị maara ihe ka ị ghọọ onye mara ihe, nʼihi na onye na-eso ndị nzuzu na-aba na nsogbu. Nsogbu bụ ihe na-esogharị ndị mmehie, ma ngọzị na-esogharị ndị ezi omume. Mgbe ezi mmadụ nwụrụ, ọ na-ahapụrụ ụmụ ya na ụmụ ụmụ ya akụ, ma mgbe onye mmehie nwụrụ, akụ ya na-abụ nke ndị ezi omume. Ubi onye ogbenye pụrụ inwe ọtụtụ ihe oriri, ma ikpe na-ezighị ezi na-azachapụ ya. Onye ọbụla na-adọghị ụmụ ya aka na ntị, na-egosi na ọ hụghị ha nʼanya; ma onye hụrụ ha nʼanya, ga-adọsi ha aka na ntị ike. Onye ezi omume na-eri nri ruo na nriju afọ onwe ya, ma nri na-akọ nʼafọ onye ajọ omume.