Izikiel. 27. Okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị, “Nwa nke mmadụ, bulie abụ akwa banyere Taịa, sị ya, gị oke obodo dị nʼọnụ oke osimiri, onye bụ onye ahịa nke mba niile dị nʼọnụ osimiri. ‘Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: “ ‘Gị onwe gị, bụ Taịa, na-asị, “Ezuru m oke nʼịma mma.” I meela ka oke ala gị dịrị nʼetiti oke osimiri. Ndị wuru gị emeekwala ka ịma mma gị zuo oke. Osisi e ji wuo ahụ ụgbọ gị sitere nʼosisi junipa nke si Senia; ọ bụkwa osisi sida nke si Lebanọn ka e ji jidesie ihu ụgbọ ahụ ike. Osisi ook nke si Bashan ka e ji mee ụmara gị niile. Osisi e si Saiprọs bubata ka e ji wuo ala ụgbọ gị, jirikwa ọdụ machie ya nʼọnọdụ ịchọ ya mma. Ezi akwa ọcha a kpara nke ọma, nke e si Ijipt bubata, ka e ji mee ọkọlọtọ gị. Akwa ndo gị bụkwa akwa na-acha anụnụ anụnụ, na odo odo, nke e si nʼobodo ọnụ mmiri Elisha bubata. Ndị ikom si Saịdọn na Avad bụ ndị na-akwọrọ gị ụgbọ mmiri gị. Ndị ǹka ndị ikom gị, gị Taịa, nọ nʼụgbọ dịka ndị ọka nʼịkwọ ụgbọ mmiri. Ndị okenye na ndị nka Gebal a maara aha ha nọ nʼime ụgbọ mmiri gị. Ọrụ ha bụ imechisi oghere ọbụla dị nʼụgbọ ahụ. Ụgbọ mmiri niile na ndị na-anya ha na-abata nʼọnụ mmiri gị nʼihi ịzụ ihe ahịa gị. “ ‘Ndị ikom Peshịa na Lidiya, na Put, jere gị ozi dịka ndị agha nʼusuu ndị agha gị. Ha kokwasịrị ọta ha na okpu agha igwe ha nʼaja ụlọ gị, na-ewetara gị ebube. Ndị ikom Avad, na Helek bụ ndị na-eche mgbidi gị nʼakụkụ niile. Ndị ikom Gamad na-eche nche nʼụlọ elu gị niile e wusiri ike. Ha konyekwara ọta ha nʼusoro na mgbidi gị, ime ka ịma mma gị zuo oke. “ ‘Tashish bụ onye ahịa gị, nʼihi ịba ụba nke akụ gị. Ọ bụ ọlaọcha na igwe, na gbamgbam, na opu, ka ha ji akwụ gị ụgwọ ihe ha si nʼaka gị zụrụ. “ ‘Ndị Griis, Tubal na Meshek, bụkwa ndị ahịa gị. Ha na-ebutere gị ndị ohu, na ihe e ji bronz kpụọ, iji kwụọ gị ụgwọ ihe ha si nʼaka gị zụrụ. “ ‘Otu a kwa ndị ikom Bet Togama jikwa ịnyịnya ụgbọ, na ịnyịnya agha, na ịnyịnya ibu na-agbanwere ihe ha zụrụ. “ ‘Ndị ahịa si na Dedan bụkwa ndị ahịa gị. Otu a kwa ọtụtụ ndị bi nʼọnụ mmiri bụkwa ndị ahịa gị. Ha ji ọdụ, na osisi eboni kwụọ gị ụgwọ ihe ha zụrụ gị. “ ‘Ndị Aram ka gị na ha zụrụ ahịa nʼihi ọtụtụ ngwa ahịa gị. Ha na-ejikwa nkume dị oke ọnụ tọkwọisi na akwa e sijiri esiji odo odo, na akwa a kpara nke ọma, na ezi akwa ọcha, na koral, na nkume oke ọnụahịa rubi na-akwụ gị ụgwọ ihe ha zụrụ gị. “ ‘Ndị Juda na ndị Izrel niile bụkwa ndị ahịa gị. Ha na-eji ọka wiiti nke si nʼobodo Minit, ya na shuga, na mmanụ aṅụ, na mmanụ, na mmanụ otite na-akwụ gị ụgwọ ihe ha zụrụ gị. “ ‘Damaskọs bụkwa ndị ahịa gị, nʼihi ọtụtụ ngwa ahịa na ụba ihe ndị ị nwere ire ere. Ọ bụkwa mmanya si Helbon, na ajị anụ dị ọcha nke esi Zaha weta, na mmanya a gbara nʼudu nʼudu nke si Ụzal, na igwe nwupụrụ enwupụ, na kashia, na kalamus, ka ha ji akwụ gị ụgwọ ihe ha zụrụ gị. “ ‘Dedan bụ onye ahịa gị nʼakwa a na-agbasa nʼelu ịnyịnya anọkwasị ọdụ. “ ‘Arebịa na ụmụ eze niile nke Keda bụkwa ndị ahịa gị. Ọ bụ ụmụ atụrụ, na ebule, na mkpi, ka gị na ha nʼazụrịta na-erekwa. “ ‘Ndị ahịa Sheba, na Raama, bụkwa ndị ahịa gị. Ha ji ụda dị iche iche na nkume dị oke ọnụahịa, na ọlaedo akwụ gị ụgwọ ihe ha zụrụ. “ ‘Ndị Haran, Kanne na Eden, na ndị ahịa Sheba, Ashọ na Kilmad, bụ ndị gị na ha zụkọrọ ahịa. Ha na-eweta uwe mara mma dị iche iche, na akwa e tejiri anụnụ anụnụ, na akwa a kpara nke ọma, na kapeeti mara mma dị iche iche, nke e ji ụdọ kpazie nke ọma, nke e tejiri nʼụdị dịkwa iche iche nʼọma ahịa gị. “ ‘Ụgbọ mmiri niile nke Tashish bụ ndị na-ebu ihe ahịa gị. I jupụtara nʼihe ahịa, gị obodo dị nʼetiti mmiri. Ndị na-anyagharị ụgbọ mmiri gị na-ebuba gị nʼosimiri. Ma ifufe siri ike nke si nʼọwụwa anyanwụ ga-etiwasị gị nʼetiti osimiri. Akụ gị niile, na ngwa ahịa gị niile, na ihe ịzụ ahịa gị niile, na ndị niile na-arụ ọrụ nʼụgbọ mmiri gị, na ndị na-anya ụgbọ mmiri, ma ndị na-edozi ụgbọ mmiri gị, ma ndị na-azụ ahịa gị, ma ndị agha gị niile, ha na ndị niile nọ nʼime ụgbọ gị ka mmiri ga-eri nʼetiti mmiri, nʼụbọchị ahụ ụgbọ gị ga-emikpu. Ala niile dị nʼọnụ mmiri ga-ama jijiji mgbe ndị ọka ụgbọ mmiri gị ga-eti mkpu akwa. Ndị niile na-anya ụgbọ mmiri, na ndị ọka ụgbọ niile nke oke osimiri, ga-esitekwa nʼụgbọ ha rịdata guzo nʼelu ala. Ha ga-eti mkpu akwa, ha ga-akwa akwa nke ukwuu, werekwa aja wụkwasị onwe ha nʼisi, na-atụrụkwa onwe ha na ntụ. Ha ga-akpụchapụ agịrị isi ha, yirikwa akwa mkpe, kwaa akwa nʼihi ịdị ilu nke mkpụrụobi ha. Ha ga-etikwa aka ha nʼobi. Mgbe ha ga na-eti mkpu akwa na-erikwa uju nʼihi gị, nke a bụ abụ akwa a ga-abụ banyere gị, “Onye ka e mere ka o dere duu ka e si mee obodo Taịa, nke osimiri gbara gburugburu?” Mgbe e si nʼime gị na-ebupụsị ihe ahịa gị, e ji ha na-enyeju mba dị iche iche afọ. E sitekwara nʼakụ gị dị ukwuu na ngwa ahịa gị mee ka ọtụtụ ndị eze nke ụwa bụrụ ọgaranya. Ugbu a, mmiri e riela gị, ọ bụ nʼokpuru osimiri ka ị tọgbọ. Akụ gị niile na ihe ahịa gị niile, na ndị niile nọ nʼime gị esorola gị laa nʼiyi. Ihe ndị a niile ga-eju ndị bi nʼala ọnụ mmiri osimiri niile anya. Ndị eze ha niile tụkwara egwu nke ukwuu; ihu ha gbarụkwara agbarụ site nʼegwu. Ndị ahịa nke mba dị iche iche na-efufe isi ha, nʼihi na ihe mere gị dị egwu. Ị laala nʼiyi ruo ebighị ebi.’ ”